Home » Past Questions » Igbo » AGHỌTAAZAAGụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.Ed...

AGHỌTAAZAAGụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.Ed...


Question

AGHỌTAAZAA

Gụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.

Ederede II


Nnenna bụ naanị nwanwaanyị nne ya Uruji mụtara. N’ihi ya, Uruji na ụmụ ya ndị nke nwoke zụtọrọ ya azụtọ. Ihe onye ọbụla nọ n’ụlọ ahụ na-achọ bụ ime ya obiọma. Azụbụike na Ugoọjị na-amụ ya ka nwa. Nnamdị na-ewelatara ya anụ ewi ụbọchị niile ya na ndị otu ya gburu ewi. Mgbe ọbụla ọ dị ha ka ọ chọrọ ibe akwa, Chikere na

Ọfọeze na-azọ azọ onye ga-aga mara ihe na-eme ya.

Ụmụnne Nnenna megidere ihe a, ruo na nne ha achọpụta na nwata a emebiela. Nke kacha wute Uruji bụ na Nnenna na-aju nri mgbe ọbụla a kpasuru ya nwaobere iwe. Oge ụfọdụ, ụmụnne ya ga na-ewere azụ dị n’ofe nke ha tinyekwuoro ya ma ya bụrụ na ọ jụghị iri nri.

Otu ụbochị, Nnenna jụrụ iri nri n’ihi na nne ya rọrọ ya anya. Ozigbo nke a mere, Uruji buuru nri ahụ nye nkịta ya. Site n’ụtụtu ruo mgbede ụbọchị ahụ, Nnenna kwụgidere agụụ, anya agwọgharịa ya. Ịjụ nri kwụsịziri iso n’ihe ndị o ji eme nwa.


N’ ederede a, otu na ndị a bụ ada Uruji.

Options

A)
Chikere.
B)
Nnenna.
C)
Ọfọeze.
D)
Ugoọjị

The correct answer is B.


More Past Questions:


Discussion