Home » Past Questions » Igbo » AGHỌTAAZAAGụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.Ed...

AGHỌTAAZAAGụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.Ed...


Question

AGHỌTAAZAA

Gụọ ederede atọ ndị a ma zaa ajụjụ niile sitere na ha.

Ederede I


Uche echefuola asị ọ tụọrọ nne na nna Ebuka na ya ga-enyere ha aka zụọ Ebuka n’akwụkwọ.Ụmụ nke ya ga-anọ n’ụlọ, Ebuka ana-ejegharị ka atụrụ na-enweghị onye nche, na-erere nne ya ukwu mmiri maọbụ ahụekere. Ezumike adịghịrị Ebuka. Ọ lọta ahịa, okwu na ụka. Nne ya ukwu akụghị ya ihe na ọ nọtere aka, ọ maa ya akantị na o rechaghị ihe o bunyere ya ree. Ọ bụzi nwamkpọta na-achụtara ezinaụlọ Uche ihe ha na-eri? Ewo, Ụwa nwa ogbenye! Ọ bụrụ na aka dị nne na nna Ebuka arọ, ọ ga-anọ n’ọnọdụ ọjọọ a?

Nke kachasị nke bụ orure a na-erezi ụmụaka n’oge a. Ndị ajọ mmadụ na-aga kpọrọ ụmụaka nọ n’agbata afọ ise ruo n’ iriabụọ n’ime obodo. Ha na-atụrụ nne na nna ụmụntakịrị ndị a asị na ha ga-akpọga ha ebe ihe ga-adịrị ha mma ma zụọkwa ha n’akwụkwọ.


‘Okwu na-ụka’ n’ederede a pụtara

Options

A) ịpịa ịtalị

B) ịba mba

C) nsogbu

D) akantị

The correct answer is C.


More Past Questions:


Discussion