Home » Past Questions » Igbo » AGHỌTAAZAAGụọ ederede ọbụla na ndị a, zaa ajụjụ niile sitere na ...

AGHỌTAAZAAGụọ ederede ọbụla na ndị a, zaa ajụjụ niile sitere na ...


Question

AGHỌTAAZAA

Gụọ ederede ọbụla na ndị a, zaa ajụjụ niile sitere na ha.

Ederede III


Ijeọma bitụrụ mma aka. Ọ bụghị naanị nke a, ọ na-anụrụ ndị mụrụ ya ihe ma na-aga ozi nke ọma. Na Klaasị ha, o nwere ndị enyi abụọ ntị fere azụ. Ha bụ Ijeego na Ọbịaraeri. Ha ji ụkwụ ebi okazi. Ha si n’otu obodo ha efere n’ọzọ ebe ha na ụmụnwoke na-eri ma na-aṅụ. Anya anaghị ahụ ha n’ụlọakwụkwọ n’ihi na mgbe niile ha nọ na njem. Ụmụagbọghọ ndị a amaghị na ihe na-atọ ụtọ na-elukwa ilu. N’otu oge, ha natara ozi n’ekwentị nke toro ha nnukwu otito maka mma ha ma gwakwa ha bịawa Warrị ebe mkpori ndụ juru. Ndi kpọrọ ha bụ ụmụokorobịa abụọ ndị na-aza Okondo na Otondo n’otu n’otu. Ihe eji mara ha bu isogbhari ụmụnwaanyi n’azu. Ijeego na enyi ya nwaanyị binyeere ụmụnwoke ndị a ịzuụka abụọ, n’agbanyeghị na ha bụ ụmụakwụkwọ. Ka izu asaa gachara, ụmụagbọghọ ndị a adaa ọrịa. Ka e mechara nnyocha ọrịa ha n’ulọọgwụ, e kwuru na ha na-arịa ọrịa mmịnwụ, ọrịa obirinajaọcha a naghị agwọta agwọta. Ugbua, eke na ihe o loro atogbọrọla.


‘Ijeọma bitụrụ mma aka’ na-akọwa na Ijeoma

Options

A)
na-achọ mma
B)
metụrụ mma aka
C)
mara mma
D)
bụ onye ọma

The correct answer is C.


More Past Questions:


Discussion